Native Bible

Judges 11:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob.

Judges 11:5 in English

Judges 11:5 · Berean Standard Bible

and made war with them, the elders of Gilead went to get Jephthah from the land of Tob.

Context

3Nʼihi nke a, Jefta gbapụrụ site nʼụlọ nna ya, gaa biri nʼobodo Tob. Mgbe na-adịghị anya, ọtụtụ ndị isi na-anụ ọkụ bịara nọnyere ya ma sorokwa ya. 4O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha. 5Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob. 6Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.” 7Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị,* ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.