Native Bible

Judges 11:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn,

Judges 11:14 in English

Judges 11:14 · Berean Standard Bible

Jephthah again sent messengers to the king of the Ammonites

Context

12Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?” 13Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.” 14Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn, 15na-asị, “Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha.* 16Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.