Ndị Ikpe 11:13
Judges 11:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.”
Judges 11:13 in English
Judges 11:13 · Berean Standard Bible
The king of the Ammonites answered Jephthah’s messengers, “When Israel came up out of Egypt, they seized my land, from the Arnon to the Jabbok and all the way to the Jordan. Now, therefore, restore it peaceably.”
Context
11Ya mere, Jefta sooro ndị okenye Gilead, ha mekwara ya onyeisi ha na ọchịagha ha. O kwughachikwara okwu ya niile nʼihu Onyenwe anyị nʼobodo Mizpa. 12Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?” 13Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.” 14Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn, 15na-asị,
“Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.