Ndị Ikpe 10:6
Judges 10:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼihu Onyenwe anyị, ha fere chi Baal na Ashtọret, chi ndị Aram, chi ndị Saịdọn, nke ndị Moab, nke ndị Amọn, na chi ndị Filistia ofufe. Ndị Izrel hapụrụ Onyenwe anyị, ha efekwaghị ya ofufe.
Judges 10:6 in English
Judges 10:6 · Berean Standard Bible
And again the Israelites did evil in the sight of the LORD. They served the Baals, the Ashtoreths, the gods of Aram, Sidon, and Moab, and the gods of the Ammonites and Philistines. Thus they forsook the LORD and did not serve Him.
Context
4O nwere ụmụ ndị ikom iri atọ, ndị na-agba ịnyịnya ibu iri atọ. Ha nwekwara obodo iri atọ nke aka ha na Gilead, nke a na-akpọkwa Havọt Jaịa ruo taa. 5Ma mgbe Jaịa nwụrụ, e liri ya na Kamon. 6Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼihu Onyenwe anyị, ha fere chi Baal na Ashtọret, chi ndị Aram, chi ndị Saịdọn, nke ndị Moab, nke ndị Amọn, na chi ndị Filistia ofufe. Ndị Izrel hapụrụ Onyenwe anyị, ha efekwaghị ya ofufe. 7Nke a mere ka Onyenwe anyị wee iwe megide ha. O nyefere ha nʼaka ndị Filistia na ndị Amọn, 8ndị mekpara ha ahụ, chie ha ọnụ nʼala. Afọ iri na asatọ ka ndị Filistia megburu ndị Izrel bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, nʼime ala ndị Amọrait, ya bụ na Gilead.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.