Native Bible

Judges 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ndị mekpara ha ahụ, chie ha ọnụ nʼala. Afọ iri na asatọ ka ndị Filistia megburu ndị Izrel bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, nʼime ala ndị Amọrait, ya bụ na Gilead.

Judges 10:8 in English

Judges 10:8 · Berean Standard Bible

who that very year harassed and oppressed the Israelites, and did so for eighteen years to all the Israelites on the other side of the Jordan in Gilead, the land of the Amorites.

Context

6Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼihu Onyenwe anyị, ha fere chi Baal na Ashtọret, chi ndị Aram, chi ndị Saịdọn, nke ndị Moab, nke ndị Amọn, na chi ndị Filistia ofufe. Ndị Izrel hapụrụ Onyenwe anyị, ha efekwaghị ya ofufe. 7Nke a mere ka Onyenwe anyị wee iwe megide ha. O nyefere ha nʼaka ndị Filistia na ndị Amọn, 8ndị mekpara ha ahụ, chie ha ọnụ nʼala. Afọ iri na asatọ ka ndị Filistia megburu ndị Izrel bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, nʼime ala ndị Amọrait, ya bụ na Gilead. 9Ndị Amọn gafekwara osimiri Jọdan ibuso ndị Juda, ndị Benjamin na ndị Ifrem agha. Ihe ndị a mere ka ọnọdụ ụmụ Izrel dị nnọọ njọ nke ukwuu. 10Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, rịọọ ya ka ọ gbapụta ha. Ha kwupụtara sị, “Anyị emehiela megide gị,* anyị ahapụla gị Chineke anyị, fee arụsị Baal ofufe.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.