Ndị Ikpe 10:4
Judges 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nwere ụmụ ndị ikom iri atọ, ndị na-agba ịnyịnya ibu iri atọ. Ha nwekwara obodo iri atọ nke aka ha na Gilead, nke a na-akpọkwa Havọt Jaịa ruo taa.
Judges 10:4 in English
Judges 10:4 · Berean Standard Bible
He had thirty sons who rode on thirty donkeys. And they had thirty towns in the land of Gilead, which to this day are called Havvoth-jair.*
Context
2O kpere Izrel ikpe iri afọ abụọ na atọ. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya na Shamia. 3Onye ikpe ọzọ nọchiri ya bụ Jaịa, onye si Gilead pụta. O kpere Izrel ikpe iri afọ abụọ na abụọ. 4O nwere ụmụ ndị ikom iri atọ, ndị na-agba ịnyịnya ibu iri atọ. Ha nwekwara obodo iri atọ nke aka ha na Gilead, nke a na-akpọkwa Havọt Jaịa ruo taa. 5Ma mgbe Jaịa nwụrụ, e liri ya na Kamon. 6Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼihu Onyenwe anyị, ha fere chi Baal na Ashtọret, chi ndị Aram, chi ndị Saịdọn, nke ndị Moab, nke ndị Amọn, na chi ndị Filistia ofufe. Ndị Izrel hapụrụ Onyenwe anyị, ha efekwaghị ya ofufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.