Jemis 4:12
James 4:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe?
James 4:12 in English
James 4:12 · Berean Standard Bible
There is only one Lawgiver and Judge, the One who is able to save and destroy. But who are you to judge your neighbor?
Context
10Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu. 11Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe. 12Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe? 13Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.” 14Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.