Jemis 4:10
James 4:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.
James 4:10 in English
James 4:10 · Berean Standard Bible
Humble yourselves before the Lord, and He will exalt you.
Context
8Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ. 9Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ. 10Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu. 11Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe. 12Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.