Jemis 4:11
James 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe.
James 4:11 in English
James 4:11 · Berean Standard Bible
Brothers, do not slander one another. Anyone who speaks against his brother or judges him speaks against the law and judges it. And if you judge the law, you are not a practitioner of the law, but a judge of it.
Context
9Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ. 10Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu. 11Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe. 12Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe? 13Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.