Native Bible

Isaiah 7:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke.

Isaiah 7:23 in English

Isaiah 7:23 · Berean Standard Bible

And on that day, in every place that had a thousand vines worth a thousand shekels of silver,* only briers and thorns will be found.

Context

21Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ. 22Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ. 23Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke. 24Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ. 25Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị. 7:1 Nʼime senchuri nke asaa, tupu a mụọ Kraịst, ndị Izrel na Siria jikọrọ aka buso ndị Asịrịa agha. Nʼoge ahụ ha gbalịrị ịkwagide Ehaz, eze Juda, ka o soro ha ga buo agha ahụ. 7:8 2Sa 8:6 7:17 2Ih 28:19-20

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.