Aịzaya 7:22
Isaiah 7:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ.
Isaiah 7:22 in English
Isaiah 7:22 · Berean Standard Bible
and from the abundance of milk they give, he will eat curds; for all who remain in the land will eat curds and honey.
Context
20Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji agụba e gotara nʼofe osimiri, nke bụ eze Asịrịa, kpụchapụ unu agịrị isi na ajị ụkwụ, kpụchapụkwa afụọnụ unu niile. 21Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ. 22Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ. 23Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke. 24Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.