Aịzaya 7:11
Isaiah 7:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.”
Isaiah 7:11 in English
Isaiah 7:11 · Berean Standard Bible
“Ask for a sign from the LORD your God, whether from the depths of Sheol or the heights of heaven.”
Context
9Isi obodo Ifrem bụ Sameria.
Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya.
Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu,
unu agaghị eguzo ma ọlị.’ ” 10Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị, 11“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” 12Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.” 13Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.