Native Bible

Isaiah 66:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile, mee ka ha ji dịrị? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ, ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.

Isaiah 66:2 in English

Isaiah 66:2 · Berean Standard Bible

Has not My hand made all these things?* And so they came into being,” declares the LORD. “This is the one I will esteem: he who is humble and contrite in spirit, who trembles at My word.

Context

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m? Ebee ka ebe izuike m ga-adị?” 2Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile, mee ka ha ji dịrị? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ, ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m. 3Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi dịka nwoke na-egbu mmadụ, onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja dị ka onye na-agbaji nkịta olu, onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka dị ka onye na-eche ọbara ezi, otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta dị ka onye na-efe arụsị. Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha, ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile. 4Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu, mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha. Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị, mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị. Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m, họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.