Aịzaya 66:1
Isaiah 66:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m? Ebee ka ebe izuike m ga-adị?”
Isaiah 66:1 in English
Isaiah 66:1 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “Heaven is My throne, and earth is My footstool. What kind of house will you build for Me? Or where will My place of repose be?
Context
1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Eluigwe bụ ocheeze m,
ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m.
Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m?
Ebee ka ebe izuike m ga-adị?” 2Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile,
mee ka ha ji dịrị?
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ,
ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu,
ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m. 3Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi
dịka nwoke na-egbu mmadụ,
onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja
dị ka onye na-agbaji nkịta olu,
onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka
dị ka onye na-eche ọbara ezi,
otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta
dị ka onye na-efe arụsị.
Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha,
ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.