Aịzaya 64:9
Isaiah 64:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe; echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Biko, lekwasị anyị anya nʼihi na ndị gị ka anyị bụ.
Isaiah 64:9 in English
Isaiah 64:9 · Berean Standard Bible
Do not be angry, O LORD, beyond measure; do not remember our iniquity forever. Oh, look upon us, we pray; we are all Your people!
Context
7Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ;
ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị.
Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ,
meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị. 8Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị.
Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite.
Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile. 9Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe;
echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
Biko, lekwasị anyị anya
nʼihi na ndị gị ka anyị bụ. 10Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara;
ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu. 11Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe,
abụrụla ihe a gbara ọkụ.
Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.