Aịzaya 64:6
Isaiah 64:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.
Isaiah 64:6 in English
Isaiah 64:6 · Berean Standard Bible
Each of us has become like something unclean, and all our righteous acts are like filthy rags;* we all wither like a leaf, and our iniquities carry us away like the wind.
Context
4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ,
ọ dịbeghị ntị ghọtara,
o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị,
onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha. 5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka,
bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha.
Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha,
iwe were gị.
A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị? 6Anyị niile dịka onye rụrụ arụ,
ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi.
Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi,
mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe. 7Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ;
ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị.
Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ,
meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị. 8Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị.
Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite.
Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.