Aịzaya 64:5
Isaiah 64:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?
Isaiah 64:5 in English
Isaiah 64:5 · Berean Standard Bible
You welcome those who gladly do right, who remember Your ways. Surely You were angry, for we sinned. How can we be saved if we remain in our sins?
Context
3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya
ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị. 4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ,
ọ dịbeghị ntị ghọtara,
o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị,
onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha. 5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka,
bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha.
Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha,
iwe were gị.
A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị? 6Anyị niile dịka onye rụrụ arụ,
ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi.
Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi,
mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe. 7Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ;
ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị.
Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ,
meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.