Native Bible

Isaiah 64:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro* gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.

Isaiah 64:2 in English

Isaiah 64:2 · Berean Standard Bible

as fire kindles the brushwood and causes the water to boil, to make Your name known to Your enemies, so that the nations will tremble at Your presence!

Context

1Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị! 2Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro* gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị. 3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị. 4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.