Aịzaya 60:19
Isaiah 60:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ, maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi, Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.
Isaiah 60:19 in English
Isaiah 60:19 · Berean Standard Bible
No longer will the sun be your light by day, nor the brightness of the moon shine on your night;* for the LORD will be your everlasting light, and your God will be your splendor.*
Context
17Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo,
nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha.
Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla,
nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe.
M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị
ezi omume ga-abụ onye na-achị gị. 18Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ.
Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa.
Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta,
ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto. 19Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ,
maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi,
Chineke gị ga-abụkwa ebube gị. 20Anwụ gị agaghị ada ada,
ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha;
nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile,
iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa. 21Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume,
ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi.
Ha bụ ome nke m kụrụ,
bụ ọrụ aka m,
ime ka ịma mma m pụta ìhè.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.