Native Bible

Isaiah 60:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo, nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha. Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla, nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe. M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị ezi omume ga-abụ onye na-achị gị.

Isaiah 60:17 in English

Isaiah 60:17 · Berean Standard Bible

Instead of bronze I will bring you gold; I will bring silver in place of iron, bronze instead of wood, and iron instead of stones. I will appoint peace as your governor and righteousness as your ruler.

Context

15“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị. 16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị.* Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb. 17Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo, nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha. Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla, nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe. M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị ezi omume ga-abụ onye na-achị gị. 18Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ. Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa. Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta, ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto. 19Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ, maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi, Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.