Native Bible

Isaiah 60:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị.* Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.

Isaiah 60:16 in English

Isaiah 60:16 · Berean Standard Bible

You will drink the milk of nations and nurse at the breasts of royalty; you will know that I, the LORD, am your Savior and your Redeemer, the Mighty One of Jacob.

Context

14Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị. Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ. Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị, Zayọn nke Onye nsọ Izrel. 15“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị. 16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị.* Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb. 17Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo, nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha. Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla, nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe. M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị ezi omume ga-abụ onye na-achị gị. 18Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ. Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa. Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta, ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.