Aịzaya 53:6
Isaiah 53:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ; onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya. Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya ajọ omume anyị niile.
Isaiah 53:6 in English
Isaiah 53:6 · Berean Standard Bible
We all like sheep have gone astray,* each one has turned to his own way; and the LORD has laid upon Him the iniquity of us all.
Context
4Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru,
burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile,
ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ,
onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ. 5Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị:
ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ.
E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ;
ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike. 6Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ;
onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya.
Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya
ajọ omume anyị niile. 7A kpagburu ya, mesie ya ihe ike,
ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta.
E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu,
dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị,
otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya. 8Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya.
Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ* ya weliri olu kwuo okwu?
Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ;
maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.