Aịzaya 53:4
Isaiah 53:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru, burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile, ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ.
Isaiah 53:4 in English
Isaiah 53:4 · Berean Standard Bible
Surely He took on our infirmities and carried our sorrows;* yet we considered Him stricken by God, struck down and afflicted.
Context
2Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome,
dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ.
O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya.
O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike. 3Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya.
Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ.
Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ.
E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla. 4Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru,
burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile,
ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ,
onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ. 5Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị:
ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ.
E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ;
ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike. 6Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ;
onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya.
Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya
ajọ omume anyị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.