Aịzaya 53:1
Isaiah 53:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye kweere ozi anyị, ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?
Isaiah 53:1 in English
Isaiah 53:1 · Berean Standard Bible
Who has believed our message? And to whom has the arm of the LORD been revealed?*
Context
1Onye kweere ozi anyị,
ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị? 2Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome,
dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ.
O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya.
O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike. 3Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya.
Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ.
Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ.
E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.