Aịzaya 42:3
Isaiah 42:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi* azọpịara azọpịa, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị. Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi.
Isaiah 42:3 in English
Isaiah 42:3 · Berean Standard Bible
A bruised reed He will not break and a smoldering wick He will not extinguish; He will faithfully bring forth justice.
Context
1“Lee ohu m, onye m na-agba ume,
onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ.
Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya.
Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. 2Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa,
maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi. 3Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi* azọpịara azọpịa,
maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị.
Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi. 4Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba,
ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa.
Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.” 5Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru,
onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha,
onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta,
onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume,
na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.