Aịzaya 42:1
Isaiah 42:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee ohu m, onye m na-agba ume, onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ. Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya. Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.
Isaiah 42:1 in English
Isaiah 42:1 · Berean Standard Bible
“Here is My Servant, whom I uphold, My Chosen One, in whom My soul delights. I will put My Spirit on Him, and He will bring justice to the nations.
Context
1“Lee ohu m, onye m na-agba ume,
onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ.
Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya.
Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. 2Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa,
maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi. 3Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi* azọpịara azọpịa,
maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị.
Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.