Aịzaya 42:4
Isaiah 42:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba, ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa. Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.”
Isaiah 42:4 in English
Isaiah 42:4 · Berean Standard Bible
He will not grow weak or discouraged * before He has established justice on the earth. In His law the islands will put their hope.”*
Context
2Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa,
maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi. 3Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi* azọpịara azọpịa,
maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị.
Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi. 4Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba,
ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa.
Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.” 5Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru,
onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha,
onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta,
onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume,
na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ. 6“Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m.
Aga m echebe gị, gbaa gị ume,
nʼihi na eweere m gị nye ndị m
ka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike.
Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.