Aịzaya 4:2
Isaiah 4:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka Alaka Onyenwe anyị mabiga mma oke, ma nwekwa ebube dị ukwuu. Ndị fọdụrụ ndụ nʼIzrel ga-enweta ihe ubi ga-enye ha ọṅụ, na nke ga-ewetara ha obi nganga na mmụọ ịnya isi.
Isaiah 4:2 in English
Isaiah 4:2 · Berean Standard Bible
On that day the Branch of the LORD will be beautiful and glorious, and the fruit of the land will be the pride and glory of Israel’s survivors.
Context
1Nʼoge ahụ, ndị ikom ole na ole ga-afọdụ ndụ.
Nke a ga-eme ka ndị inyom asaa na-azọ otu nwoke.
Ha ga-abịakwute ya sị ya “Kwere ka anyị niile bụrụ ndị nwunye gị!
Anyị ga-akpara onwe anyị nri,
zụọra onwe anyị akwa. Naanị kwere ka anyị na-aza aha gị,
ka a ghara ịkọ anyị ọnụ.” 2Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka Alaka Onyenwe anyị mabiga mma oke, ma nwekwa ebube dị ukwuu. Ndị fọdụrụ ndụ nʼIzrel ga-enweta ihe ubi ga-enye ha ọṅụ, na nke ga-ewetara ha obi nganga na mmụọ ịnya isi. 3Ndị ahapụrụ na Zayọn, ndị nọ na Jerusalem ka a ga-akpọ ndị dị nsọ, bụ ndị ahụ niile e dere aha ha nʼetiti ndị bi nʼime Jerusalem. 4Onyenwe anyị ga-asachapụ unyi niile nke ndị inyom Zayọn, ọ ga-asachapụkwa ọbara niile dị na Jerusalem site na mmụọ nke ikpe, na mmụọ nke ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.