Native Bible

Isaiah 38:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:

Isaiah 38:9 in English

Isaiah 38:9 · Berean Standard Bible

This is a writing by Hezekiah king of Judah after his illness and recovery:

Context

7“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa. 8Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri. 9Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike: 10Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ, bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?” 11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ nʼala ndị dị ndụ, m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ, maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.