Native Bible

Isaiah 38:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.

Isaiah 38:7 in English

Isaiah 38:7 · Berean Standard Bible

This will be a sign to you from the LORD that He will do what He has promised:

Context

5“Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. 6Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a. 7“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa. 8Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri. 9Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.