Native Bible

Isaiah 32:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla nʼime ha ga-aghọrọ ndị mmadụ ebe a na-ezere ndụ nʼoge oke ifufe, na ebe mgbaba nʼoge oke mmiri ozuzo. Ha ga-adị ka mmiri na-asọ nʼọzara, maọbụ dịka ndo nke nkume dị elu na-enye nʼebe okpomọkụ na-eweta ike ọgwụgwụ dị.

Isaiah 32:2 in English

Isaiah 32:2 · Berean Standard Bible

Each will be like a shelter from the wind, a refuge from the storm, like streams of water in a dry land, like the shadow of a great rock in an arid land.

Context

1Lee, eze ga-achị nʼezi omume na-abịa, ya na ndịisi kwesiri ntụkwasị obi, ndị ga-ekpe ikpe ziri ezi. 2Onye ọbụla nʼime ha ga-aghọrọ ndị mmadụ ebe a na-ezere ndụ nʼoge oke ifufe, na ebe mgbaba nʼoge oke mmiri ozuzo. Ha ga-adị ka mmiri na-asọ nʼọzara, maọbụ dịka ndo nke nkume dị elu na-enye nʼebe okpomọkụ na-eweta ike ọgwụgwụ dị. 3Mgbe ahụ, agaghị emechikwa anya ndị niile na-ahụ ụzọ, agakwaghị eme ka ntị na-anụ ihe kwụsị ịnụ ihe. 4Ọ bụladị obi ndị nzuzu nʼetiti ha ga-ejupụta nʼakọnuche na nghọta, ndị ahụ na-asụ nsụ ga-ekwukwa okwu nke ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.