Aịzaya 30:32
Isaiah 30:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya, tie ha nʼahụ ga-adị ka egwu ụbọ akwara na une dị iche iche na-enye, mgbe ọ na-eweli aka ya na-eti ha oke ihe otiti dịka ọ na-alụso ha ọgụ.
Isaiah 30:32 in English
Isaiah 30:32 · Berean Standard Bible
And with every stroke of the rod of punishment * that the LORD brings down on them, the tambourines and lyres will sound as He battles with weapons brandished.
Context
30Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube,
ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala
jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa,
jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe. 31Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu;
ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala. 32Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya,
tie ha nʼahụ
ga-adị ka egwu ụbọ akwara na une dị iche iche na-enye,
mgbe ọ na-eweli aka ya na-eti ha oke ihe otiti dịka ọ na-alụso ha ọgụ. 33Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga.
A kwadoola ebe a ga-akwanye ọkụ nke ga-erechapụ eze ahụ.
Ọ bụ ebe sara mbara, nke dị omimi,
na nke a kwajuru nkụ.
Ọ bụ iku ume Onyenwe anyị
nke dịka mwụpụta nke nkume na-enwu ọkụ
ka a ga-eji mụnye ya ọkụ.
30:1 Nke a bụ nʼihi mmekọrịta ha na ndị Ijipt 2Ez 18:21.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.