Native Bible

Isaiah 28:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Geenụ ntị, nụrụnụ olu m, ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu.

Isaiah 28:23 in English

Isaiah 28:23 · Berean Standard Bible

Listen and hear my voice. Pay attention and hear what I say.

Context

21Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim, ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya. 22Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo, ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa. Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi. 23Geenụ ntị, nụrụnụ olu m, ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu. 24Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ? Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla? 25Mgbe o gwuzesịrị ya, ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin? Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya, ọka balị nʼebe o kwesiri, na spelti nʼebe o kwesiri?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.