Aịzaya 28:23
Isaiah 28:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Geenụ ntị, nụrụnụ olu m, ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu.
Isaiah 28:23 in English
Isaiah 28:23 · Berean Standard Bible
Listen and hear my voice. Pay attention and hear what I say.
Context
21Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim,
ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn,
ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa,
na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya. 22Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo,
ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa.
Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi. 23Geenụ ntị, nụrụnụ olu m,
ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu. 24Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ?
Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla? 25Mgbe o gwuzesịrị ya,
ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin?
Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya,
ọka balị nʼebe o kwesiri,
na spelti nʼebe o kwesiri?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.