Aịzaya 28:22
Isaiah 28:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo, ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa. Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi.
Isaiah 28:22 in English
Isaiah 28:22 · Berean Standard Bible
So now, do not mock, or your shackles will become heavier. Indeed, I have heard from the Lord GOD of Hosts a decree of destruction against the whole land.
Context
20Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya;
akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma. 21Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim,
ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn,
ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa,
na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya. 22Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo,
ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa.
Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi. 23Geenụ ntị, nụrụnụ olu m,
ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu. 24Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ?
Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.