Aịzaya 24:22
Isaiah 24:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ, kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide, tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.
Isaiah 24:22 in English
Isaiah 24:22 · Berean Standard Bible
They will be gathered together like prisoners in a pit. They will be confined to a dungeon and punished after many days.
Context
20Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu.
Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị.
Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ,
nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya. 21Nʼụbọchị ahụ,
Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ.
Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ. 22A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ,
kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ
nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide,
tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe. 23Ọnwa ga-ada mba,
anwụ ka ihere ga-eme;
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achị
nʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem,
ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.