Aịzaya 24:19
Isaiah 24:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụwa adapịasịala; ụwa agbawasịala; e jirila oke ike nugharịa ụwa.
Isaiah 24:19 in English
Isaiah 24:19 · Berean Standard Bible
The earth is utterly broken apart, the earth is split open, the earth is shaken violently.
Context
17Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu,
unu ndị niile bi nʼụwa. 18Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu
ga-adaba nʼolulu;
onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta
ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya.
Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu.
Ntọala ụwa na-amakwa jijiji. 19Ụwa adapịasịala;
ụwa agbawasịala;
e jirila oke ike nugharịa ụwa. 20Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu.
Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị.
Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ,
nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya. 21Nʼụbọchị ahụ,
Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ.
Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.