Aịzaya 24:16
Isaiah 24:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa. Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.” Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ! Ahụhụ dịrị m! Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị. Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.”
Isaiah 24:16 in English
Isaiah 24:16 · Berean Standard Bible
From the ends of the earth we hear singing: “Glory to the Righteous One.” But I said, “I am wasting away! I am wasting away! Woe is me.” The treacherous betray; the treacherous deal in treachery.
Context
14Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ;
ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị. 15Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto.
Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu
ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu. 16Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa.
Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.”
Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ!
Ahụhụ dịrị m!
Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị.
Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.” 17Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu,
unu ndị niile bi nʼụwa. 18Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu
ga-adaba nʼolulu;
onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta
ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya.
Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu.
Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.