Aịzaya 24:14
Isaiah 24:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ; ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị.
Isaiah 24:14 in English
Isaiah 24:14 · Berean Standard Bible
They raise their voices, they shout for joy; from the west * they proclaim the majesty of the LORD.
Context
12Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe,
e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile. 13Otu a ka ọ ga-adị nʼụwa niile,
nakwa nʼetiti mba niile,
dịka mgbe a na-etitusi mkpụrụ dị nʼelu osisi oliv,
maọbụ mgbe ahapụrụ ụfọdụ mkpụrụ grepu nʼelu osisi mgbe a ghọchasịrị ihe ubi. 14Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ;
ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị. 15Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto.
Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu
ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu. 16Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa.
Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.”
Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ!
Ahụhụ dịrị m!
Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị.
Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.