Aịzaya 14:3
Isaiah 14:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu,
Isaiah 14:3 in English
Isaiah 14:3 · Berean Standard Bible
On the day that the LORD gives you rest from your pain and torment, and from the hard labor into which you were forced,
Context
1Ma Onyenwe anyị ga-emekwara Jekọb ebere;
ọ ga-ahọpụtakwa ndị Izrel ọzọ,
meekwa ka ha lọghachi bịa biri nʼala nke aka ha.
Ọtụtụ ndị ọbịa dị iche iche ga-adịnyere ha,
soro ezinaụlọ Jekọb bikọtaa ọnụ. 2Mba dị iche iche ga-enyere ha aka ịlọghachi nʼala ha,
nke Onyenwe anyị nyere ha.
Mba ndị a ga-aghọkwa ndị dị nʼokpuru ụmụ Izrel,
ghọọkwara ha ndị ohu nwoke na nwanyị.
Ụmụ Izrel ga-adọtakwa nʼagha ndị ahụ dọtara ha nʼagha na mbụ,
ma chịakwa ndị ahụ kpagburu ha nʼoge gara aga. 3Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu, 4unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị.
Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ.
Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa! 5Nʼihi na Onyenwe anyị anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe,
meekwa ka mkpara ndị na-achị achị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.