Aịzaya 1:22
Isaiah 1:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọlaọcha gị aghọọla unyi, ezi mmanya gị aghọọla nke a gwafere mmiri oke.
Isaiah 1:22 in English
Isaiah 1:22 · Berean Standard Bible
Your silver has become dross; your fine wine is diluted with water.
Context
20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi,
ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.”
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya. 21Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi
aghọọla onye akwụna!
Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi;
ezi omume na-anọbu nʼime ya,
ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ. 22Ọlaọcha gị aghọọla unyi,
ezi mmanya gị aghọọla nke a gwafere mmiri oke. 23Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi,
ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi,
onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya,
na-agbasokwa onyinye.
Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna
ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha. 24Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị,
“Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m,
ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.