Hosiya 12:10
Hosea 12:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A gwara m ndị amụma, ọ bụ m mere ka ha hụ ọhụ dị iche iche, sitekwa nʼọnụ ndị amụma tụọ ilu dị iche iche.”
Hosea 12:10 in English
Hosea 12:10 · Berean Standard Bible
I spoke through the prophets and multiplied their visions; I gave parables through the prophets.
Context
8Ifrem kwuru,
“Abaala m ọgaranya! Abụrụla m onye nwere akụnụba dị ukwuu!
Ọ bụ ezie na m bụ onye nwere akụ dị ukwuu,
ma agaghị achọta njehie maọbụ mmehie ọbụla nʼime m.” 9“Abụ m Onyenwe anyị na Chineke gị,
onye si nʼIjipt kpọpụta unu.
Aga m emekwa ka ị biri nʼụlọ ikwu ọzọ,
dịka ọ dị nʼoge mmemme ndị ahụ niile a kara aka. 10A gwara m ndị amụma,
ọ bụ m mere ka ha hụ ọhụ dị iche iche,
sitekwa nʼọnụ ndị amụma tụọ ilu dị iche iche.” 11Gilead ọ na-eme ajọ ihe?
Ndị ya bụ ndị efulefu.
Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal?
Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume,
nke dị nʼubi a kọrọ akọ. 12Jekọb gbalagara nʼala Aram;
Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye,
nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.