Native Bible

Hosea 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ọnụọgụgụ ụmụ Izrel ga-adị ka aja dị nʼọnụ oke osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ tụọ nʼihe ọtụtụ. Nʼebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ nʼebe ahụ ka a ga-anọ sịkwa ha, ‘Ụmụ Chineke dị ndụ ka unu bụ.’

Hosea 1:10 in English

Hosea 1:10 · Berean Standard Bible

Yet the number of the Israelites will be like the sand of the sea, which cannot be measured or counted. And it will happen that in the very place where it was said to them, ‘You are not My people,’ they will be called ‘sons of the living God.’*

Context

8Mgbe ọ jụrụ Lo-Ruhama ara, ọ tụụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwoke. 9Onyenwe anyị sịrị, “Kpọọ aha ya Lo-ammi,* nke pụtara unu abụghị ndị m, nʼihi na unu abụghị ndị nke m, mụ onwe m abụkwaghị Chineke unu. 10“Ma ọnụọgụgụ ụmụ Izrel ga-adị ka aja dị nʼọnụ oke osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ tụọ nʼihe ọtụtụ. Nʼebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ nʼebe ahụ ka a ga-anọ sịkwa ha, ‘Ụmụ Chineke dị ndụ ka unu bụ.’ 11A ga-achịkọtakwa ndị Juda na ndị Izrel ọnụ. Ha ga-ahọpụtakwara onwe ha otu onyeisi, si nʼala ahụ rigopụta, nʼihi ihe ukwu ka ụbọchị Jezril ga-abụ. 1:6 Nke a pụtara onye a na-ahụghị nʼanya maọbụ, obi ebere adịghịkwa 1:9 Nke pụtara, ọ bụghị ndị nke m

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.