Hosiya 1:8
Hosea 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ jụrụ Lo-Ruhama ara, ọ tụụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwoke.
Hosea 1:8 in English
Hosea 1:8 · Berean Standard Bible
After she had weaned Lo-ruhamah, Gomer conceived and gave birth to a son.
Context
6Emesịa, Goma tụụrụ ime ọzọ, mụta nwa nwanyị. Ọ gwara ya, “Aha ị ga-agụ ya bụ Lo-Ruhama,* nʼihi na agaghị m enwekwa obi ebere ọzọ nʼahụ ụlọ Izrel, ịgbaghara ha mmehie ha. 7Ma aga m enwe obi ebere nʼahụ ụlọ Juda. Mụ onwe m ga-azọpụta ha site na Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Agaghị m eji ngwa agha ọbụla, dịka ụta maọbụ mma agha maọbụ ike ibu agha maọbụ ịnyịnya maọbụ ndị na-agba ịnyịnya zọpụta ha.” 8Mgbe ọ jụrụ Lo-Ruhama ara, ọ tụụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwoke. 9Onyenwe anyị sịrị, “Kpọọ aha ya Lo-ammi,* nke pụtara unu abụghị ndị m, nʼihi na unu abụghị ndị nke m, mụ onwe m abụkwaghị Chineke unu. 10“Ma ọnụọgụgụ ụmụ Izrel ga-adị ka aja dị nʼọnụ oke osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ tụọ nʼihe ọtụtụ. Nʼebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ nʼebe ahụ ka a ga-anọ sịkwa ha, ‘Ụmụ Chineke dị ndụ ka unu bụ.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.