Ndị Hibru 6:5
Hebrews 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa,
Hebrews 6:5 in English
Hebrews 6:5 · Berean Standard Bible
who have tasted the goodness of the word of God and the powers of the coming age—
Context
3Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe. 4Ma ọ dịghị mfe ịkpọghachi ndị dara ada ọzọ, bụ ndị natarala ihe ahụ na mbụ, ndị detụkwara onyinye amara dị iche iche nke si nʼeluigwe bịa ire, ndị ketakwara oke Mmụọ Nsọ, 5ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa, 6ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ. 7Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.