Ndị Hibru 3:12
Hebrews 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa.
Hebrews 3:12 in English
Hebrews 3:12 · Berean Standard Bible
See to it, brothers, that none of you has a wicked heart of unbelief that turns away from the living God.
Context
10Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ.
Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile.
Ha amatabeghị ụzọ m niile.’ 11Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị,
‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”* 12Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa. 13Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. 14Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.