Ndị Hibru 13:5
Hebrews 13:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”*
Hebrews 13:5 in English
Hebrews 13:5 · Berean Standard Bible
Keep your lives free from the love of money and be content with what you have, for God has said: “Never will I leave you, never will I forsake you.”*
Context
3Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu. 4Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe. 5Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola,
“Agaghị m ahapụ gị.
O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”* 6Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo,
“Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu.
Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”* 7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.