Native Bible

Hebrews 11:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site nʼokwukwe, Mosis e kweghị aza nwa ada Fero mgbe o tolitere.

Hebrews 11:24 in English

Hebrews 11:24 · Berean Standard Bible

By faith Moses, when he was grown, refused to be called the son of Pharaoh’s daughter.

Context

22Nʼọgwụgwụ ndụ ya, Josef sitere nʼokwukwe kwuo banyere ọpụpụ ụmụ Izrel ma nyekwa ntụziaka banyere olili ọkpụkpụ ya. 23Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere. 24Site nʼokwukwe, Mosis e kweghị aza nwa ada Fero mgbe o tolitere. 25Ọ họọrọ isoro ụmụ Chineke keta oke na mmegbu ha karịa inwe aṅụrị nke mmehie. 26O kpebiri na ọ bụ ihe karịchara mma ịhụ ahụhụ nʼihi Kraịst, kama inweju akụ niile nke Ijipt afọ. Nʼihi na o nwere olileanya maka ụgwọ ọrụ dị nʼihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.