Ndị Hibru 11:22
Hebrews 11:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼọgwụgwụ ndụ ya, Josef sitere nʼokwukwe kwuo banyere ọpụpụ ụmụ Izrel ma nyekwa ntụziaka banyere olili ọkpụkpụ ya.
Hebrews 11:22 in English
Hebrews 11:22 · Berean Standard Bible
By faith Joseph, when his end was near, spoke about the exodus of the Israelites and gave instructions about his bones.
Context
20Ọ bụ okwukwe ka Aịzik jiri nye Jekọb na Ịsọ ngọzị banyere ihe dị nʼihu. 21Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef nʼotu nʼotu tupu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya. 22Nʼọgwụgwụ ndụ ya, Josef sitere nʼokwukwe kwuo banyere ọpụpụ ụmụ Izrel ma nyekwa ntụziaka banyere olili ọkpụkpụ ya. 23Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere. 24Site nʼokwukwe, Mosis e kweghị aza nwa ada Fero mgbe o tolitere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.