Ndị Hibru 10:32
Hebrews 10:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara.
Hebrews 10:32 in English
Hebrews 10:32 · Berean Standard Bible
Remember the early days that you were in the light.* In those days, you endured a great conflict in the face of suffering.
Context
30Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,”* ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”* 31Ọ bụ ihe dị oke egwu ịdaba nʼaka Chineke dị ndụ. 32Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara. 33Mgbe ụfọdụ, a kparịrị unu nʼihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nʼoge ọzọ, unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso. 34Unu were obi ebere soro ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ taa ahụhụ, unu jikwa ọṅụ nabata ya mgbe a nakọrọchara unu ihe niile unu nwere, nʼihi na unu onwe unu matara na unu nwere ihe ka mma, nke na-anọgide.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.