Native Bible

Hebrews 10:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,”* ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”*

Hebrews 10:30 in English

Hebrews 10:30 · Berean Standard Bible

For we know Him who said, “Vengeance is Mine; I will repay,”* and again, “The Lord will judge His people.”*

Context

28Onye ọbụla dara iwu Mosis, na-anwụ na-enweghị ebere, site nʼakaebe mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara megide ya. 29Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe? 30Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,”* ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”* 31Ọ bụ ihe dị oke egwu ịdaba nʼaka Chineke dị ndụ. 32Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.